MMIRICHUKWU NKE ONYENWEANYI Nnukwu Emume - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 42: 1-4, 6-7
-
Abụọma na azịza ya
Ps 28: 1-4, 9-10
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
Ndị Ozi 10: 34-38
- OziọmaLk 3: 15-16, 21-22
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Is 42: 1-4, 6-7
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Nke a bụ nwodibo m onye m ji eme onu, onye m họọrọ, onye ihe ya na-amasi m. Etinyela m mmụọ m n'ime ya. O ga-ewetara mba niile ikpe nkwumoto. O gaghi eti mkpu, ma ọ bụ kwusie okwu ike, a gaghi anu olu ya n'okporo ụzọ. O gaghi agbaji osisi na-esighi ike, ma ọ bụ menyuo ọkụ na-achọ inyu anyu. O ga-akwudosi ike n'iweta ikpe nkwumoto. Ike agaghi agwu ya, o gaghi adakwa mba ruo mgbe o ga-akwụwa ikpe nkwumoto n'elu ụwa. Mba niile bi n'akuku osimiri ga-echere nkuzi ya. M onwe m bụ Yahweh, akpọla m unu ka unu buru ndị eziomume. Esekpụụrụ m unu n'aka nye unu onodu. Unu abụrụla ìhè ogbugbandu m na ndị mmadụ ìhè nke mba niile. Unu ga-eme ka ndị kpuru isi hụrụ ụzọ, mee ka ndị e ji eji nwere onwe ha, mee ka ndị nọ n'ochichiri nweta ihe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 28: 1-4, 9-10
Azịza: Onyenweanyi ga-eji udo agozi ndị nke Ya.
1. Unu bụ ụmụ Chineke, nyenu Dinwenu,
Nyenu Dinwenu otito na ike.
Nyenu Dinwenu otito kwesiri aha ya,
Sekpuoronu Dinwenu n'ebe Ya dị nso.
Azịza: Onyenweanyi ga-eji udo agozi ndị nke Ya.
2. Olu nke Dinwenu na-ada uda n'elu mmiri.
Olu nke Dinwenu na-ada uda n'elu nnukwu osimiri.
Olu nke Dinwenu juputara n'ike;
Olu Dinwenu di nnukwu ebube.
Azịza: Onyenweanyi ga-eji udo agozi ndị nke Ya.
3. Chineke di ebube na-agba ka egbe eluigwe.
N'ebe Ya di nso, mmadụ niile na-eti mkpu na-asi: "Otito."
Onyenweanyi nọ n'oche eze Ya n'elu mmiri.
Onyenweanyi nọ n'ugwu eze ya ruo mgbe ebighi ebi.
Azịza: Onyenweanyi ga-eji udo agozi ndị nke Ya.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ: Ndị Ozi 10: 34-38
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ndị Ozi
Pita bidoro okwuchukwu ya, si, "Ugbu a aghotala m n'eziokwu na Chineke anaghi akpa oke obula. Kama n'obodo obula, o na-anabata onye na-aturu ya egwu, na-arukwa oru eziomume. Unu maara nke ọma okwu nke o ziteere ụmụ Izrel, na-agbasa ozioma nke udo site n'ọnụ Jesu Kristi onye nwe mmadụ na ihe niile. Okwu ahụ e kwusara na Judia niile, bido na Galili mgbe Jon kwuchara maka mmirichukwu. Unu makwa maka Jesu onye Nazaret otu Chineke si nye ya Mmụọ Nsọ na ike, o gaghariri na-eme iheoma, na-agwo ndị ọrịa na ndị ekwensu kere agbụ, n'ihi na Chineke nọnyere ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Eluigwe meghere.
E wee nu ka olu nke Nna kwuru si:
"Onye a bụ Nwa M, M hụrụ n'anya."
Alleluia
OZIỌMA : Lk 3: 15-16, 21-22
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Ebe ọ bụ na ndị mmadụ nọ n'olileanya, mmadụ niile na-atugharị n’ime obi ha, ihe gbasara Jon, na-ajụ ma ọ bụ ya bụ Kristi ahụ. Jon azaa ha si, "Eji m mmiri, eme unu mmirichukwu, ma onye ka mike na-abia, onye m na-etosighị ítụpu eriri akpukpo ukwu ya. O ga-eji Mmụọ Nsọ na oku mee unụ mmirichukwu." Mgbe Jon mechara ndị niile nọ ebe ahụ mmirichukwu, na n'oge e mechara Jesu mmirichukwu, Jesu nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere; Mmụọ Nsọ biakwasa ya n'ụdị nduru. Olu siri n'eluigwe daa, si, "Nwa m; m hụrụ n'anya, ihe gị na-amasi m."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu