Izu nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume Hilary - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 1: 1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 97: 1 and 2b, 6 and 7c, 9
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 1: 14-20
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Heb 1: 1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Pol di aso degara ndi Hibru
N'oge ochie, Chineke sitere n'uzo di iche iche gwa nna anyị ha okwu site n'onu ndị amuma; n'ogwugwu oge ndị a, gwala anyị okwu site na nwa ya, onye Chineke họpụtara ka o bụrụ onye nketa nke ihe niile, onye o si na ya kee ụwa. O na-achapụtagharịa otito nke Chineke na akara nke ụdị ya, site n'ike nke okwu ya ka o ji jide ụwa. Mgbe O sachapuchara njo, ọ nọdurụ n'aka nri nke onye kacha elu. Ugbu a, ọ bụ onye di elu karịa ndị mmụọoma dị ka aha o nwetara si karịa nke ha elu.
Nwa Ahu Kacha Ndi Mmuooma
Chinekegwara ya si, "I bụ nwa m, taa amutara m gị," ma ọ bụ, "Aga m abụ nna ya, ya onwe ya ga-abụkwa nwa m." Ọzokwa, mgbe o zitere nwa ya n'ụwa, o kwuru si, "Ka ndị mmụọma Chineke niile kpooro ya isi ala."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 97: 1 and 2b, 6 and 7c, 9
Azịza: Tookwanu aha Onyenweanyi, unu ndị eziomume.
1. Onyenweanyi bụ eze! Ka ụwa nuriba;
Nurjanụ, ala niile mmiri gbara gburugburu.
O Jin eziomume na ikpe nkwumoto
were too ntọala ocheeze ya.
Azịza: Tookwanu aha Onyenweanyi, unu ndị eziomume.
2. Eluigwe na-ekwuputa eziomume ya,
mba niile na-ahukwa otito ya.
Chineke niile sekpuoronu Onyenweanyi.
Azịza: Tookwanu aha Onyenweanyi, unu ndị eziomume.
3. N'ihina ị bụ Onyenweanyi,
onye kacha elu n'ụwa niile,
Onye kacha elu chi ndọrọ elu.
Azịza: Tookwanu aha Onyenweanyi, unu ndị eziomume.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Site n'ozioma anyị,
o kporo unu ka unu wee nweta
otito nke Dinwenu anyị Jesu Kristi.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 1: 14-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ka e jidechara Jon, Jesu biara na Galili na-ekwusa ozioma nke Chineke. Wee na-asi, "Oge ezuola, alaeze Chineke abiala nso. Chegharia ma kwerenu n'ozioma." Mgbe o na-aga n'usoro osimiri Galili, o hụrụ ndị okuazu abụọ, Saimon na Andru nwanne ya, ka ha na-awunye ugbu ha na mmiri. Ma Jesu siri ha, "Sobe m, aga m eme unu ndị na-akuta mmadụ." Ngwa ngwa, ha hapụrụ ihe niile ha ji egbu azu, sobere ya. Ka o gaturu n'ihu ntakịrị, o hụrụ ụmụnne abụọ, Jemis na Jon, ụmụ Zebedi, ka ha nọ n'ugbo, na-edozi ihe ha ji akwadebe azu. Ozigbo ahụ o kporo ha; ha hapụrụ nna ha Zebedi na ndị ọrụ ngo ha n'ugbo, sobere ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu