Toozde Izu Uka nke mbu n'oge na-adanyeghi n'emume St Joseph Vaz - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 3: 7-14
-
Abụọma na azịza ya
Ps 95:6-7c, 8-9, 10-11
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 1:40-45
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Heb 3: 7-14
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Galeshịa
Ya bụ, dika Mmuo Nsọ si kwuo: "Taa, mgbe unu nuru olu ya, unu akpochila obi unu dika unu mere na nnupuisi, dika unu mere n'ubochi ahụ unu nwara m n'ozara, ebe nna unu nwalere m, ma hụ aka oru m afọ iri anọ."
N'ihi nke a, e wesarala m ogbo ahụ iwe, ma si, "Ha na-ejehie ụzọ mgbe niile n'obi ha, ha amatabeghi ụzọ m." N'ihi nke a, anụrụ m iyi n'iwe m si, "Ha agaghị abata n'ezumike m." Kpacharanu anya, umunna m, ka a ghara inwe mmụọ ọjọọ n'ime onye ọ bụla n'ime unu, obi ekwe-ekwe nke ga-eduba unu n'idachapụ n'aka Chukwu di ndu. Na-adụritanu onwe unu odu, ubochi ọ bula, ka a ghara inwe onye ọ bula n'ime unu ga-enwe obi mkpọchi n'ihi aghụghọ nke njo. Anyị na-eketa oke na Kristi ma ọ bụrụ na anyị ejidesie ntukwasi obi anyị mbụ ike ruo n'isi njedebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 95:6-7c, 8-9, 10-11
Azịza: Taa, ọ bụrụ na unu nụrụ olu ya, unu akpochila obi unu.
1. Bianụ, ka anyị fee Onyenwe anyị, kpooro ya isi ala,
ka anyị sekpue n'ihu Onyenwe anyị Onye kere anyị.
N'ihi na ọ bụ Chineke anyị!
Anyi na-a bukwa ndi nke ya, igwe atụrụ ọ na-azụ.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na unu nụrụ olu ya, unu akpochila obi unu.
2. Mere na Meriba, na n'ụbọchị ahụ na Masa n'ime ọhịa,
mgbe nna unu ha nwalere m,
mgbe ha nwalere m,
na-agbanyeghi na ha hụrụ ihe m mereela ha.
Azịza: Taa, ọ bụrụ na unu nụrụ olu ya, unu akpochila obi unu.
3. Afọ iri anọ zuru ezu ka iwe m n'ebe agbụrụ ahụ nọ,
nke mere m jiri si, "Ndị a bụ ndị na-ekwesighị ntukwasi obi,
ndi jụrụ iso ụzọ m."
N'ihi ya, anụrụ m iyi n'iwe si,
"Ha agaghị abata n'ala ezumike ahụ m kwere ha na nkwa."
Azịza: Taa, ọ bụrụ na unu nụrụ olu ya, unu akpochila obi unu.
Alleluia, Alleluia:
Jesu kwuputara ozi ọma nke ala eze.
O gworo ọrịa dị iche iche na-arịa
Alleluia
OZIỌMA : Mk 1:40-45
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Otu onye ekpenta bịakwutere Jesu, daa n'ukwu ya, na-arịọ ya si, "Ọ bụrụ na i choro, i nwere ike ime ka m dị ọcha." N'obi ebere, Jesu setịpụrụ aka ya, bitụrụ ya, si, "Achọrọ m; dị ọcha." Ozigbo ahụ, orja ahụ hapụrụ ya, ọ wee dị ọcha. Ma Jesu dosiri ya aka na ntị ike; zila ya otu ihu ahụ. O gwara ya si, "Hụkwa na o nweghị onye ọ bụla ịkọọrọ nke a, ma gaa gosi onye nchụaja onwe gị, chekwaa n'ihu Chineke ihe onyinye dịka Mosis nyere n'iwu, ka o buuru ndị mmadụ ihe ama na e meela ka ị dị ọcha." Ma o siri ebe ahụ pụọ malite kwusaba okwu banyere ọgwụgwụ ya, nke mere na o dighịkwa Jesu mfe ịbanye n'ime obodo, kama ọ gara nọrọ ebe ndị mmadụ na-ebighi, ma ndị mmadụ sị akụrụngwa niile na-abịakwute ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu