Monde Izu Nke Ato N'oge Na-adanyegị N'emume Angela Merici - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hib 9: 15, 24-28
-
Abụọma na azịza ya
Abụ Ọma 98: 1, 2-3ab, 3cd-4, 5-6
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMak 3: 22-30
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Hib 9: 15, 24-28
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Hibru
Kristi bụ onye ọchịgbọ nke ọgbụgba ndụ ọhụrụ ka ndị a kpọrọ nwee ike inata ihe nrite ebeebe ahụ e kwere n’azụ nkwa, ebe ọ bụ na otu onye nwụrụ iji gbapụta ha n’ajọ ihe n'okpuru ọgbụgba ndụ mbụ. Kristi n’onwe ya abaghị n’ebenso e ji aka mee, nke bụ nanị ihe atụ nke ezi ụlọ nsọ ahụ. Kama o banye n'eluigwe n'onwe ya ebe ọ nọ ugbu a n'ihu Chineke n'ihi anyị. Kristi adịghị eji onwe ya atụ àjà ugboro ugboro dịka onye isi nchụàjà si eji ọbara na-abụghị nke ya abanye n'ebe dị nsọ ahụ afọ ọ bụla. N’ihi na ọ bụrụ otu a, Kristi gaara na-ata ahụhụ ugboro ugboro kemgbe ụwa bidoro. Ma dị ka o si dị, ọ pụtara nanị otu ugboro n'ọgwụgwụ oge, were onwe ya tụchie àjà iji wepụ ajọ omume. Otu a ka e mekwara ka mmadụ nwụọ otu ugboro, nke a gachaa ọ bụrụ ikpe; N'otu aka ahụ, Kristi jiri onwe ya tụchie àjà otu ugboro iji buru ajọ omume ọtụtụ ndị mmadụ. O ga-abịa ọzọ ugboro nke abụọ, ọ bụghị maka iluso ajọ omume ọgụ, kama ọ bụ iji zọpụta ndị ji ntụkwasị obi n'obi na-eche ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Abụ Ọma 98: 1, 2-3ab, 3cd-4, 5-6
Azịza: Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ, n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube.
1. Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ
n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube;
aka nri ya na aka ya dị nsọ eweterela ya mmeri.
Azịza: Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ, n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube.
2. Onyenweanyi egosila nzọpụta ya;
ọ kpọpụtala ezi omume ya n’ebe mba niile nọ.
O chetara ịhụnanya ya na ịdị njikere ya
n'ebe ezinaụlọ Izrel nọ.
Azịza: Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ, n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube.
3. Akụkụ ụwa niile ahụla
nzọpụta nke Chineke anyị!
Uwa niile tiere Onyenweanyi mkpọtụ ọṅụ.
Werenu abụ na mkpọtụ ọṅụ too ya.
Azịza: Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ, n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube.
4. Kwere Onyenweanyi abụ.
Werenu ubo na ngwá egwu dị iche iche
tiere Onyenweanyi egwu.
Werenu ọpị igwe na mpịkwụputa
na Onyenweanyi bụ eze.
Azịza: Kwere Onyenweanyi abụ ọhụrụ, n’ihi na ọ rụrụ ọrụ ebube.
Mbekụ:
Alleluia, Alleluia:
Were eziokwu gị doo ha nso, n'ihi na okwu gị bụ eziokwu.
Alleluia
OZIỌMA : Mak 3: 22-30
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Ndị odeakwụkwọ si na Jerusalem bịadata na-ekwukwa, sị, "Mụọ Belzebul ejidela ya, ọ bụkwa n'ike mụọ ọjọọ ka ọ ji achụpụ ndị ajọmmụọ." N'ihi nke a, Jisọs kpọrọ ha, malite ịgwa ha ilu ndị a sị, "Olee otu ekwensu ga-esi achụpụ ekwensu? Alaeze ọ bụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzo. Ezinaụlọ ọ bụla kewara ekewa iji megide onwe ya agaghị eguzokwa. Ọ bụrụkwa na ekwensu ebiliere megide onwe ya, ọ gaghị eguzo; kama, njedebe ya abịarụla nso. Ọ dịghị onye nwere ike ibanye n'ụlọ dike zụọ ihe o ji biri, ma ọ bụrụ na ọ bụghị ịchọ ịkọcha ya. Mgbe ọ mere nke a, ọ ga-enwe ike izu ihe niile dị n'ụlọ ya. N'ezie, agwa m unu, a ga-agbaghara ụmụ mmadụ mmehie niile na nkwulu ọ bụla ha kọrọ; ma onye ọ bụla kọrọ nkwulu megide Mụọ Nsọ agaghị enweta mgbaghara, kama ọ nọ n'ikpé arụ, ebeebe." O kwuru nke a n'ihi na ụfọdụ n'ime ha sịrị, "Ọ nwere mmụọ ọjọọ n'ime ya."
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu