Monde: Izu nke anọ n'oge na-adanyeghị n'emume Blaise/Ansgar - Green

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Heb 11:32-40
-
Abụọma na azịza ya
Ps 31:20-24
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 5:1-20
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Heb 11:32-40
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hibru
Olee ihe ọzọ m ga-ekwu? Oge ga-agwụna m ikwu gbasara Gidion, Barak, Samsin, Jefta, Devid, na Samuel na ndị amụma. Ndị sitere n'okwukwe merie ọtụtụ alaeze, wetara ikpe nkwụmọtọ, natakwara nkwa e kwere, mechiekwa ọnụ ọdụm. Ha menyuru ọkụ dị egwu, gbalahụkwa mma agha, nweta ike site n’adịghị ike. Ha bịakwara bụrụ ndị dị ike n’agha, wee chụlata ndị agha ndị mba ọzọ. Ụmụnwaanyị ụfọdụ sitere n'okwukwe weghachitere ndị nke ha nwụrụ anwụ site na mbilite n’onwu. Ụfọdụ jụrụ inara ntọhapụ. Ha nọgidere n’ahụhụ ka ha wee nwee ike ibili banye na ndụ ka mma. Ndị ọzọ kwa ka e mere akaaja, pia ha utari, Ụfọdụ ka e kẹrè agụ, tụọ ha n'ụlọ mkpọrọ. A tụrụ ha okwute, kwọbie ha abụọ. E ji mma agha gbuo ha. Ha yi akpụkpọ atụrụ na ewu na-agagharị, ha enweghị ihe ọ bụla. A tara ha ahụhụ ma megbukwa ha. Ha bụ ndị ụwa a na-ekwesịghị, ha na-agagharị n’ọzara na n’elu ugwu na-ebikwa n'ọgba na n’ọnụ dị n’ime ala. Ndị a niile anataghi ihe Chineke kwere na nkwa, n’agbanyeghị na ha gbaara ha akaebe site n’okwukwe. Etu o dị, Chineke akwadeberela anyị ihe kaara anyị mma ndị a agaghị eme ka ha zuo oke ma e wepu anyị.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 31:20-24
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
1. Lee ka ịdị mma gị siri dị ukwuu,
o Osebụrụwa nke i dobere ndị niile na-atu gị egwu
na-enye ndị niile gbabara na gị,
ka ụwa niile wee jiri anya ha hụ.
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
2. N’ihu gị ka i na-ezobe ha,
ka atụmụta ndị ajọ omume ghara imetụ ha;
n’udo nke gị ka i na-ezobe ha,
ka ọnụ ajọ okwu ghara imetụ ha.
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
3. Ngozi dịrị Osebụrụwa,
onye jiri ịhụnanya aruru m ọrụ dị ịtụnanya
n’obodo e wusiri ike.
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
4. Nke a mere m ji tie mkpu si,
"Esila n’ihu gị chụpụ m!”
Mana ị nụrụ arịrịọ m niile,
mgbe m tịkụrụ gị mkpu enyemaka.
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
5. Unu ndị kwụsiri ike,
hụ Osebụrụwa n’anya.
Chineke na-echekwa ndị kwere na ya,
mana ọ na-akụ ndị ngala ụgwọ ka ọrụ ha siri dị.
Azịza : Nwee n’ụ obi siri ike, unu niile bụ ndị chekwubere n’Osebụrụwa.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Chineke sitere na Kristi mee ka anyị na ya dị n'otu,
ọ tinyela n'aka anyị ozi banyere ụzọ
o si eme ka ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ozo.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 5:1-20
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jeso na ndị na-eso ụzọ ya bịarutere n’akụkụ nke ọzọ nke osimiri Galili, n’ala ndị Gerasenes. Ma mgbe Jeso siri n’ụgbọ pụta, otu nwoke ndị mmụọ ọjọọ jị si n’ebe a na-eli ozu wee bịakwute ya. Nwoke a weere ebe a na-eli ozu dị ka ebe obibi ya. Ọ nweghị onye ọ bụla nwere ike, ike ya agbụ. Ọ bụladị ma e jiri ígwè; n’ihi na ọtụtụ mgbe ka e werelee ya ígwè nta na ígwè ụkwụ kee ya, ma ọ nyachipụchara ígwè ụkwụ niile ahụ; gbajisịkwaa ndị ntakịrị. Ọ nweghịkwa onye ọ bụla nwere ike ijideli ya. Abalị na ehihie niile ọ na-anọ n’elu ugwu na-eti mkpu, werekwa nkume na-achakasi onwe ya ahú. Ma mgbe ọ nọ n’otu aka hụ Jeso, ọ gbakwụụrụ ya, sekpọrọ ya, jiri olu ike tie mkpu si, "Gịnị ka mụ na gị nwekoro, Jeso, Nwa Chineke kacha elu? Eji m aha Chineke na-agwa gị ka ị ghara ịta m ahụhụ." Nwoke ahụ kwuru otu a n’ihi na Jeso siri ya, "Si n'ime ya pụta, gị mmụọ ọjọọ!" Jeso jụrụ ya si, "Gịnị bụ aha gị?" Nwoke ahụ zara si, "Aha m bụ ọtụtụ, n’ihi na anyị dị ọtụtụ." Ma ọ rịọrọkwa Jeso ike ka ọ ghara ichụpụ ha n’ala ahụ. Ụfọdụ igwe ezi nọ nso n’ugwu ahụ na-akpa nri; ma ndị mmụọ ọjọọ ahụ rịọrọ Jeso si, "Ziga anyị n’igwe ezi ndị a ka anyị banye n'ime ha." Jeso nyere iwu, ndị mmụọ ọjọọ ahụ wee pụọ, banye n’ime igwe ezi ahụ nke dị ka puku abụọ. Ha siri n'ebe dị mkpoda jiri ọsọ gbaba n'ime oke osimiri ahụ; mmiri wee gbagbuo ha. Ndị na-elekọta ezi ahụ gbalagara, kọọsa ihe mere n’ime obodo na n’ala ahụ niile. Ọtụtụ mmadụ bịara ka ha were anya ha hụ ihe ahụ mere. Ha bịakwutere Jeso, hụ nwoke ahụ ndị mmụọ ọjọọ nọbu n'ime ya, ebe nọdụrụ ala, yiri uwe, uche ya ezukwaa oke; ụjọ wee tuo ha. Ndị hụrụ ya kọsara otu e si gụọ nwoke ahụ mmụọ ọjọọ jị na ihe mere igwe ezi ahụ. Ha malitere ịrịọ Jeso ka ọ pụọ n’oke ala ha. Ma mgbe Jeso na-achọ ịbanye n'ụgbọ mmiri, nwoke ahụ ndị mmụọ ọjọọ jibu rịọrọ ka ọ sọọbe ya. Ma Jeso jụrụ, si nwoke ahụ, "Lakwụrụ ndị enyi gị, kọọrọ ha ihe niile Chineke mere gị, na otu o si mere gị ebere." Ọ pụrụ, gaa mpaghara Dekapolis na-ekwusa ihe niile mere ya. Nke a gbagwojuru ndị mmadụ niile anya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu