Izu nke ise n'oge na-adanyeghị n'emume Cyril and Methodius - M - White

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Gn 3: 1-8
-
Abụọma na azịza ya
Ps 32: 1-2. 5. 6. 7
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMk 7: 31-37
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Gn 3: 1-8
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Genesis
Ugbu a, agwọ bụ anụ kacha aghọ aghụghọ n'anụmanụ niile nke Yahweh Chineke kere. Ọ jụrụ nwaanyị ahụ, “Ọ bụ ezie na Chineke sịrị na unu agaghị ata mkpụrụ osisi ọ bụla dị n'ime ogige a?” Nwaanyị ahụ zara agwọ ahụ sị, “Anyị nwere ike ịta mkpụrụ osisi niile dị n'ogige a. Ma Chineke sịrị, ‘Unu agaghị ata mkpụrụ nke osisi ahụ dị n'etiti ogige a; unu agaghịkwa emetụ ya aka; unu taa ya ma ọ bụ metụ ya aka, unu ga-anwụrịrị.’” Mgbe ahụ agwọ ahụ wee gwa nwaanyị ahụ sị, “Unu agaghị anwụ! Chineke maara n’ezie na ụbọchị unu tara ya, anya unu ga-emeghe, unu abịa dịka Chineke, mara ihe ọma na ihe ọjọọ.” Nwaanyị ahụ hụrụ na osisi ahụ dị mma oriri, ma dịkwa mma n'anya, hụkwa na osisi ahụ na-akpali agụụ maka amamihe nke o nwere ike inye. O weere mkpụrụ osisi ahụ taa, ma wekwazie otu nye di ya, ọ taa. Mgbe ahụ, anya ha abụọ wee meghee, ha mata na ha gba ọtọ. Ha weere akwụkwọ fig dọọ ọnụ iji kpuchie onwe ha akwa ọmụma. Nwoke ahụ na nwunye ya nụrụ ụda ukwu Yahweh Chineke ka ọ na-aga n'ime ogige ahụ oge ụbọchị jụrụ oyi, ha weere zọpụ onwe ha n'ihu Yahweh Chineke n'etiti osisi niile nke ogige ahụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA : Ps 32: 1-2. 5. 6. 7
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.
Ngozi na-adịrị onye nke e gbaghaara njọ ya;
onye nke e kpochapụrụ mmehie ya.
Ngozi diri onye ahụ Onye-nwe-anyị amaghị ikpe,
onye aghụghọ adịghị n'ime obi ya.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.
N'ikpeazụ, ekwere m na m mere njọ,
anakwaaghi m ezo njọ m ezo.
Asịrị m, “Aga m ekwupụta njo m n'ihu Onye-nwe-anyị.”
Ị wee gbaghara m nju m niile.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.
Ya mere ndị nke gị niile ji ebe gị nọ mgbe ọ bụla ha nọ na nsogbu—
ọ bụrụgodị na nsogbu ekworo ka ide mmiri bịa, ọ gaghị eru ha ahụ.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.
Gị bụ ebe mgbaba m.
Ị na-echebe m n'oge nsogbu.
Nzukọ ukwe nzọpụta agba m gburugburu.
Azịza: Ngozi na-adịrị ndị nke a gbaghaara njọ ha.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
My onwe m bụ ụzọ, eziokwu na ndụ,
Onye-nwe-anyị na-ekwu.
Ọ dịghị onye ọ bụla ga-abịakwute
Nna ma ọ bụghị site na m.
Alleluia
OZIỌMA : Mk 7: 31-37
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Mak dere
Jesu siri n'oke ala Taịa pụọ, gafee Sidon, si na mpaghara Dekapolis ruo osimiri Galili. Ha kpọtara ya otu nwoke ntị chịrị nke na-asụkwa oke nsụ. Ha rịọrọ ya ka o bikwasịa ya aka. Jesu siri n'ìgwè mmadụ ahụ kpụpụ ya iche, tinye mkpịsị aka ya n'ntị abụọ nke onye ahụ ntị chịrị, bụsakwa mkpịsị aka ya asụ, detụ ya n'ire onye ogbi ahụ; o wee lelie anya n'eluigwe, suo ude, sị nwoke ahụ, “Efetá!” nke pụtara “Meghee.” Ntị nwoke ahụ meghere; ire ya toghasikwala, ọ kwukwara okwu nke ọma. Jesu nyere ndị nọ ebe ahụ iwu ka ha ghara ịkọrọ onye ọ bụla banyere ọrụ ebube a. Ma ka ọ na-agwa ha ka ha ghara ikwu, ka ha gara n'ihu na-akọsa ọrụ ya karị. Ọ tụrụ ha n'anya nke ukwuu, nke mere na ha na-esi, “O meela ihe niile nke ọma. Ọ na-eme ọbụladị ndị ntị chịrị ka ha nụ ihe, na-emekwa ndị ogbi ka ha kwuo okwu.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu