Tuzde Izu uka nke mbu n'oge ncheta ahuhu Kristi Eulogius - Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Is 55: 10-11
-
Abụọma na azịza ya
Ps 34:4-5.6-7. 16-17. 18-19
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaMt 6: 7-15
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ : Is 55: 10-11
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Aizaya
Dịka otu mmiri ozuzo na aka mmiri igwe na-esi n'eluigwe ezo, anaghi alaghachi azụ ruo mgbe ọ gbasara mmiri n'ụwa, bia mezie ala ka ọ mee ihe, ka mkpụrụ a kụọ na-adọba, nye onye ọlụ ugbo oriri ọ ga-eri.
Otu a ka okwu na-esim n'ọnụ m apụta si dị; ọ nweghị ike igbapụ laghachikwute m kama ọ ga-emejuputa ihe m bún'obi, ma mezuokwa ihe m jiri maka ya zipụ ya.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 34:4-5.6-7. 16-17. 18-19
Azịza: N'ime ahuhu ha niile, Onye nwe anyị na-azọpụta ndị umeala.
1. Soronu m kwupụta ịdị ukwuu nke Onye nwe anyị,
soro m too aha ya! Akpọkọrọ m Onye nwe anyị,
ọ zara m, ọ zọpụta m n'egwu niile na-atụ m.
Azịza: N'ime ahuhu ha niile, Onye nwe anyị na-azọpụta ndị umeala.
2. Ihu ọbụla chere n'ebe Onye nwe anyị nọ na-amụke-amụke;
ihere anaghi eme ya ma ọ dịrị ndụ.
Onye nwe anyị na-anụ mkpu àkà nwa ogbenye,
ọ na-enyekwara ya aka n'nsogbu ya niile.
Azịza: N'ime ahuhu ha niile, Onye nwe anyị na-azọpụta ndị umeala.
3.Onye nwe anyị na-elekọta ndị ezi omume
anya na-egekwa mkpu áká ha nti,
ma na-agbarụ ihu n'ebe ndị ajọ omume nọ;
o na-eme ka a ghara icheta ha n'ụwa.
Azịza: N'ime ahuhu ha niile, Onye nwe anyị na-azọpụta ndị umeala.
4. Ndị ezi omume kpọkọrọ Onye nwe anyị,
ọ zara ha wee zọpụta ha na nsogbu ha niile.
Onye nwe anyị na-anọ n'etiti ndị obi lọghara elu nso,
na-enyere ndị dara mba na mmụọ aka.
Azịza: N'ime ahuhu ha niile, Onye nwe anyị na-azọpụta ndị umeala.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Mkpụrụ obi m na-eche Onye nwe anyị,
na nkwá ya ka m nwere nchekwube,
n'ihi na ihunanya Onye nwe anyị dị okpu,
n'ime ya ka nnukwu nzọpụta dị!
Alleluia
OZIỌMA : Mt 6: 7-15
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Matiu dere
Jisus gwara ndị na-eso ụzọ ya sị: “Mgbe unu na-ekpe ekpere, unu ekwụkwala ọtụtụ okwu na-abaghị uru, dịka ndị mba ọzọ si eme; n'ihi na ha na-eche na site n'ọtụtụ okwu, Chineke ga-anụ ekpere ha. Unu emekwala ka ha, n'ihi na Nna unu maara mkpa unu tupu unu arịọ ya. Ya bụ, na-ekpe n'ekpere otu a: 'Nna anyị nọ n'eluigwe, ka otito dịrị aha gị. Ka ọchịchị gị bia, ka e mee uche gị n'ụwa, dịka e si eme ya n'eluigwe. Nye anyị taa nri nke ụbọchị anyị; gbaghara anyị mmehie anyị dịka anyị si gbaghara ndị mehieara anyị. Ekwela ka anyị kwenye na nranye ma zọpụta anyị n'ajọ ihe.' N'ihi na ọ bụrụ na unu agbaghara ndị mmadụ mmehie ha, Nna unu nke bi n'eluigwe ga-agbagharakwa unu; mana ọ bụrụ na unu agbaghaghị ibe unu mmehie ha mere unu, Nna unu agaghị agbaghara unu mmehie unu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu