Satode Izu Uka nke Atọ n'oge ncheta ahuhu Kristi Oswald of Worcester Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hos 6:1-6
-
Abụọma na azịza ya
Ps 51:3-4. 18-19. 20-21ab
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk 18:9-14
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Hos 6:1-6
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Hoseya
"Bìjanu ka anyị laghachikwuru Yahweh. Ọ doriela anyị, ma Ọ ga-agwọkwa anyị. Ọ tụrụla anyị ahụ, ma Ọ ga-ekechikọta onya anyị. Ọ ga-eme ka anyị dịkwa ndụ mgbe ụbọchị abụọ gachara; na ụbọchị nke atọ, Ọ ga-eme ka anyị bilie ka anyị wee dịkwa ndụ n'ihu Ya. Ka anyi gbalịanu imata Yahweh, n'ihi na obibia Ya doro anya dịka chi ọbubo, Ọ ga-abiakụtụ anyị dịka mmiri ozuzo, dịka mmiri na-ezosa ala n'oge udu mmiri. Gịnị ka m ga-eji gị mee, o Ifrem? Gịnị ka m ga-eji gị mee, o Juda? Ịhụnanya unu dịka igirigi ụtụtụ, igirigi nke anaghị ewe oge; ọ gbasapụsa. Nke a mere m ji si n’ọim ndjamuma gburie ha n’ibè n’ibè, ejila m okwu si m n’ọnụ gbuo ha, amamikpe m achawapụta ka ihe. Maka na ìhunaanya kwusiri ike bụ ihe na-amasi m, ọ bụghị aja; imara Chineke, ọ bụghị aja onyinye nsurekọ."
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 51:3-4. 18-19. 20-21ab
Azịza: Ọ bụ ikwudosi ike, ọ bụghị aja ka Onyenweanyi na-achọ.
1. Meere m ebere, o Chineke, site n’ịhụnanya Gi,
site na nnukwu obi ebere Gi hichapụ njo m niile;
sachapụ mmehie m niile, wuchapụ m na njo.
Azịza: Ọ bụ ikwudosi ike, ọ bụghị aja ka Onyenweanyi na-achọ.
2. Ị naghị enwe mmụọ ọ bụla n’aja,
Aja nsurekọ anaghị atọọ Gi uto;
Aja a na-achụpụ Chineke bụ obi gbawara ụkwụ.
Azịza: Ọ bụ ikwudosi ike, ọ bụghị aja ka Onyenweanyi na-achọ.
3. Dị site n’obioma Gi, meere Zayon ebere,
ruzie mgbidi Jerusalem.
Mgbe ahụ, ga-anabata aja a chụrụ n’obi ọcha,
Aja nsurekọ na ihe nehu aja niile.
Azịza: Ọ bụ ikwudosi ike, ọ bụghị aja ka Onyenweanyi na-achọ.
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
Chineke, kenye obi dị ọcha n'ime m,
nyeghachikwa m anụrị nke nzọpụta Gi.
Alleluia
OZIỌMA : Lk 18:9-14
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Jesu kọwara ụfọdụ, bụ ndị na-ewere onwe ha ka ndị ezi omume ma hụ ndị ọzọ ka ndị ajọ omume. Ndị nwoke abụọ gara n'ụlọ nsọ ikpe ekpere. Otu n'ime ha bụ onye Farisii, nke ọzọ bụ onye onautụ. Onye Farisii ahụ guzoro kpesara onwe ya ekpere nke a si, "Chineke, ekele m Gi, na adịghị m ka ndị mmadụ ọzọ, ndị na-azọrọ ihe ndị ọzọ n'aka ike, ndị omempụ, ndị okwụrụ, ma ọ bụkwa nke m na-adi ka onye onautụ a. Ana m ebu ọnụọgụ ugboro abụọ n’izimka. Ana m enyekwa otu ụzọ n’ụzọ iri nke ihe niile m kpatara." Onye onautụ ahụ, nke kwụ n'ebe di anya, ekweghi ilele ihu n’eluigwe. Kama o na-eti aka n’obi na-asi, "Chineke, meere m nwata bụ onye njo ebere."
Agwa m unu, nwoke a lara n'ụlọ ya buru onye eziomume karịa onye nke ọzọ. Onye ọ bụla buliri onwe ya elu, a ga-ebuda ya, ma onye ọ bụla budara onwe ya ala, a ga-ebuli ya elu.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu