SONDE UKA NKE ANO N'OGE NCHETA AHUHU KRISTI : Psalter Week 4 Violet

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Jos 5:9a. 10-12
-
Abụọma na azịza ya
Ps 34:2-3. 4-5. 6-7 (9a)
-
Ihe ọgụgụ nke abụọ
2 Cor 5:17-21
- OziọmaLk 15:1-3, 11-32
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ: Jos 5:9a. 10-12
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Joshuwa
Chineke wee gwa Joshua, si, "N'ụbọchị taa ewepụla m ihere ịbụ ọhu nke Ịgypt n'ebe unu nọ." Ya mere e ji akpọ ebe ahụ Gilgal ruo taa. Umu Izrel mara ụlọikwuu ha na Gilgal, mee mmemme oriri Ngabiga n'ụbọchị nke iri na anọ nke ọnwa ahụ na mgbede n'ala Jeriko dị larịị. N’echi ya, ka oriri Ngabiga gachara, n'ụbọchị ahụ ha riri ihe ubi ala ahụ metara, achicha ekoghi eko na ọka a hụrụ n’oku. Bido ụbọchị ahụ, ụbọchị ha riri ihe ala ahụ, mepụtara nri mana kwụsịrị ịda. Umu Izrel enweghikwa mana ọzọ na-ani nri si n'ala Kenaan ka ha na-eri, bido n'afọ ahụ.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA YA: Ps 34:2-3. 4-5. 6-7 (9a)
Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenu dị ụtọ.
1. Aga m aga ozi Dinwenu mgbe niile.
Otito Ya ga-adị n’ọnụ m mgbe niile;
mkpụrụobi m ga-eji Dinwenu na-etuto ọnụ.
Ndi umeala ga-anụ ya, wee nụrịọ.
Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenu dị ụtọ.
2. Soro m too Dinwenu. Ka anyi jikoo ọnụ too aha Ya.
Achọrọ m Dinwenu, ọ wee zaa m oku;
biakwa zọpụta m n’egwu m niile.
Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenu dị ụtọ.
3. Lee anya ebe ọ nọ, ka ọnụ ọchị waa gị.
Ka ihere ghara ikpuchi gị ihu.
Ogbenye nke a kpokuru Ya:
Dinwenu anụrụ olu Ya; wee nzogbu ya niile.
Azịza: Detụ ọnụ ka ị hụ na Dinwenu dị ụtọ.
IHE ỌGỤGỤ NKE ABỤỌ : 2 Cor 5:17-21
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Ozi Pọl dị asọ degaara ndị Korintians
Otu o dị, ọ bụ na onye ọ bụla amalite ndụ n'ime Kristi, ọ ghọrọ onye e kere ọhụụ; ihe ochie agala, nke ọhụrụ wee nochie. Ndị a niile bụ aka ọrụ Chineke, onye sitere na Kristi mee ka anyị na Ya dị n'otu, nyekwa anyị ọrụ ime ka Chineke na mmadụ dị n'otu. Ihe nke a pụtara bụ na Chineke sitere na Kristi na-eme ka Ya na ụwa dị na mma. Chineke adịghịkwa agụkọrọ ụmụ mmadụ mmehie ha niile, kama ọ tinyela n'aka anyị ozi banyere ụzọ ọ si eme ka Ya na ụmụ mmadụ dịkwa na mma ọzọ. Anyị bụ ndị nnọchite anya nke Kristi. Chineke sitere n'ime anyị na-akpọ unu oku. Anyị na-arịọ unu n’aha Kristi ka unu na Chineke dịkwa na mma ọzọ. Ọ bụ n'ihi anyị ka Chineke jiri mee ka Kristi were ọnọdụ na ahụhụ dịrị ndị mmehie ebe ọ meghere njo ọ bụla, Chineke mere nke a ka anyị wee bụrụ ndị eziomume nke Ya n'ime Kristi.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
Mbeku:
Alleluia, Alleluia:
A ga mahapụ ebe a gakwuru nna m gwa ya si:
"Nna, emejọọla m eluigwe na gị."
Alleluia
OZIỌMA :Lk 15:1-3, 11-32
Ihe Ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere
Mgbe ahụ, ọtụtụ ndị onautụ na ndị omenjọ bịakwutere Jesu inụ okwu Ya. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ tamụrụ na-asi, "Nwoke a na-anabata ndị omenjọ soro ya na-eri ihe." Jesu wee jiri ukabuilu a gwa ha okwu si, Jesu kwukwara si, "Otu nwoke nwere umunwoke abụọ. Nke nta n'ime ha siri nna ha, 'Nnaa, kee ihe gị niile ugbu a, nye m nke m.' Nna ha kekwaara mmadụ abụọ a ihe o nwere. Ụbọchị ole na ole gachara, nke nta n'ime ha kpokọta ihe niile o nwere gaa n’obodo ọzọ dị anya, n'ebe ahụ ka o mefuchara ihe niile o nwere site n’ibi ndụ nzuzu. Mgbe o mefuchara ihe niile, oke ụnwu dara n’obodo ahụ, o malite inọ n’ụlọ o gara nọnyere otu onye obodo ahụ, onye zigara ya n’ubi ya izu ezi. Ọ gaara amasị ya iri nri umu ezi ahụ rịọrọ, mana na ọ nweghị onye nyere ya ihe ọbụla. Mgbe o matara onwe ya, o siri, 'Mmadu ole bụ ndị oru ngo nọ n’ubi nna m na-eri, na-anụ, na-eme ihe oriri otu di ha mma, ma ano m ebe a na-anwụ n’agwụ! Aga m ebili, lakwuru nna m, aga m asị ya: Nna, e mehiela m megide eluigwe, megidekwa gị, etosighi m ka a kpokwaa m nwa gị ọzọ, na-akpaso m agwa dịka otu n’ime ndị oru gị.' O biliri lakwuru nna ya. Ma mgbe o ka nọ ebe di anya, nna ya hụrụ ya, nwee obi ebere n'ebe Ọ nọ, gbara ọsọ, makụọ ya, susukwaa ya ọnụ. Nwa ahụ siri ya, 'Nna m, emehiela m megide eluigwe ma megidekwa gị, etosighi m ka a kpokwaa m nwa gị ọzọ.' Mana nna ya siri umuodibo ya, 'Mee unu ọsọ, chọpụta uwe mwuda kacha mma, yibenu ya, gbawanu ya mgba aka na akpukpoukwu; kpuputanu nwa ehi gbara abuba, gbuonu ya, ka anyị kpoo oriri, nwekwaa anuri. N’ihi nwa m nke a anwụolara, bia dikwa ndụ ọzọ, ọ fukwara efu, e wee hụ ya.' Ha bidoro nụrịọ ọnụ." Ma mgbe nke a na-eme, nwa nwoke ahụ nke okenye nọ n’ubi. Mgbe o bjaruru nso n'ụlọ, o nuru ụda egwu na-akụnu. O kpọrọ otu nwodibo nna ya, jụọ ya ihe na-eme. O zara ya si, 'Nwanne gị nwoke alotala, nna gị egbuola nwa ehi ahụ gbara abuba, n’ihi na ọ lotara n’udo na ahụike.' Iwe were ya, nke na ọ chọghịkwa ịbanye n’ụlọ. Nna ya pụtara rio ya. Mana o siri nna ya, 'Lee, ọtụtụ afọ ndị a ka m nọ na-agbara gị odibo, ọ nweghị mgbe m nupụrụ isi n’iwu gị, ọ nweghị mgbe ị kpunyere m, ọ buladi nwa ewu, ka mụ na ndị enyi m rie, ma nurikwa. Mana mgbe nwa gị nke a lotara, onye ya na umunwaanyi akwuna ripjachara ihe niile i nwere, ị gbuuru ya nwa ehi ahụ gbara abuba.' Nna ya siri ya, 'Nwa m, mụ na gị nọ mgbe niile, ihe niile m nwere bụ nke gị. Ọ kwesiri ekwesi ka anyi kpoo oriri ma nụrịọ, maka na nwanne gị anwụolara ma dikwa ndụ ọzọ, ọ fukwara efu, e were hụ ya.'
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu