Ncheta Ezenwaanyị jiri Okwukwe nara Ahụhụ.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hib: 5:7-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps: 31: 1-2, 3-4, 5-6, 15-16, 20.
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaJn: 19:25-27
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Hib: 5:7-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’akwụkwọozi e degaara ndị Hibru
Mgbe Jesu ka dị ndụ na anụ ahụ, o ji ibe akwa na anyammiri chee ekpere na arịrịọ ya n’ihu onye ahụ nke nwere ike ịzọpụta ya n’ọnwụ. A nụrụ olu ya n’ihi ịtụ egwu nke Chineke ya. Ọ bụ ezie na ọ bụ nwa Chineke, ma o sitere n’oke ahụhụ mụta irubeisi; mgbe e mechara ya ka o zuo oke, ọ ghọọrọ ndị niile na-erubere ya isi, isi iyi nke nzọpụta ebeebe.
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps: 31: 1-2, 3-4, 5-6, 15-16, 20.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
1. Na gị, ka m gbabara, O Osebụrụwa;
ekwekwala ka ihere mee m;
site n’eziomume gị zọpụta m,
Gee m ntị, bịa ọsọọsọ ka ị zọpụta m.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
2. Bụrụ nkume nke mgbaba m,
ide nke ga-azọpụta m
N’ihina ị bụ nkume m, na ide m;
n’ihi aha gị dube m, ma chekwaba m.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
3. Ekwekwala ka m daba n’ọnya ha kweere m,
n’ihina gị bụ ebe mgbaba m.
N’aka gị ka m tinyere mmụọ m,
Ị gbapụtala m Osebụrụwa.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
4. Na gị ka m tụkwasịrị m obi, O Osebụrụwa.
Ana m ekwu sị, “Gịnwa bụ Chineke m.”
Ụbọchị m niile dị gị n’aka;
Zọpụta m n’aka ndịiro m na ndị na-emekpa m ahụ.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
5. Lee ka ịdịmma gị siri dị ukwuu, O Osebụrụwa
nke I dobeere ndị niile na-atụrụ gị egwu
na nke I na-enye ndị niile gbabara na gị
ka ụwa niile wee jiri aka ha hụ.
Azịza: Were ịhụnaanya Gị zọpụta m
MBEKU:
ALLELUIA, ALLELUIA:
Ma mmaagha ga-amawa gị obi ka e were kpughe ihe dị ọtụtụ mmadụ n’obi.
ALLELUIA.
OZIỌMA –Jn: 19:25-27.
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Oziọma dị asọ nke Jọn dere
Marịa nne Jesu na nwanne ya nwaanyị na nwunye Klopas nakwa Meri nke Magdala kwụ n’akụkụ obe. Mgbe Jesu hụrụ nne ya na nwaazụ nke ahụ Ọ hụrụ n’anya, ọ sịrị nne ya, “Nwaanyị, lee nwa gị!” Ọ sịkwara onye ahụ na-eso ụzọ ya, “Lee nne gị!” Site n’oge ahụ, onye ahụ na-eso ụzọ ya kpọọrọ nne Jesu laa, ka o biri n’ụlọ ya.
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu