Fraịde Izuụka nke Iri Abụọ na Ise N’Oge Adanyeghị n’Emume.

-
Ihe ọgụgụ nke mbụ
Hg: 2:1-9
-
Abụọma na azịza ya
Ps. 43:1, 2, 3, 4
- Ihe ọgụgụ nke abụọ
- OziọmaLk: 9:18-22
IHE ỌGỤGỤ NKE MBỤ –Hg: 2:1-9
Ihe Ọgụgụ e wetara n’Akwụkwọ Onye Amụma Hagaị
N’afọ nke abụọ nke onyeeze Darius, n’ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa asaa, okwu nke Yahweh si n’ọnụ onye amụma Hagaị kwuru sị, “Ugbu a gwa Zerubabel nwa Shialtiel onyeisi ọchịchị nke Juda, gwakwa Jọshụa nwa Jehozadak onyeisi ụkọchukwu nakwa ndị niile fọdụrụnụ okwu sị, O nwere onye fọdụrụ n’ime ụnụ hụrụ ụlọnsọ a oge ọ nọ n’ebube ya mbu? Kedụ ka I si ahụ ya ugbu a? Ọ bụ na ọ dịghị ka ihe efu n’ihu ụnụ? Ma ugbu a obi sie gị ike Zerubabel! Ọ bụ Yahweh na ekwu. Obi sie gị ike Jọshụa nwa Jehozadak onyeisi ụkọchukwu; obi sie ụnụ ike mmadụ niile nọ n’obodo ahụ!, Ọ bụ Yahweh na-ekwu; rụọnụ ọrụ n’ihina anọnyeere m ụnụ, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na ekwu. Mmụọ m nọ n’etiti ụnụ, egwu atụla ụnụ! N’ihina Yahweh nke igwe ndịagha kwuru nke a: oge na-adịghị anya, aga m akwagharị eluigwe na ala, osimiri na ala kpọrọ nkụ. Aga m akwagharị mba niile, akụ ha ga-abịa jupụta ụlọnsọ a. Aga m eme ụlọnsọ a ka o jupụta n’ebube, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu. Ọlaọcha bụ nke m, ọlaedo bụkwa nke m. Ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu. Ebube nke ụlọnsọ ọhụrụ a ga-akarị nke ochie. Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu; n’ebe a ka m ga-enwe ọganiihu, ọ bụ Yahweh nke igwe ndịagha na-ekwu.”
Okwu nke Oseburuwa
A. Eneke dịrị Chukwu
ABỤỌMA NA AZỊZA – Ps. 43:1, 2, 3, 4
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
1. Chekwaba m Chineke, gbuoro m ọgụ
N’aka ndị na-enweghị obi ebere
Zọpụta m n’aka ndị nrafu na ndị aghụghọ, O Chineke.
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
2. Ọ bụ gị Chineke bụ ebe mgbaba m
gịnị mere i ji hapụ m?
Gịnị mere m ji na-agagharị na-eru uju,
ndịiro m were na-emegide m?
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
3. Zipụta ihe gị na eziokwu gị ka ha na-edu m,
Ka ha dubata m n’ugwu gị dị nsọ
ebe i jiri mere ebe obibi.
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
4. Mgbe ahụ aga m aga n’ebe nchụaja nke Chineke,
Chineke nke bụ añụrị m
Aga m eji añụrị were ụbọ too gị
Onyenweanyị, Chineke m.
Azịza: Nwee nchekwube na Chineke, aga m etokwa ya ọzọ, onye nzọpụta m na Chineke m
MBEKU:
Alleluịa, Alleluịa:
Naranụ ozi nke anyị wetaara ụnụ,
ọ bụghị dịka okwu mmadụ kama dịka ihe
Ọ bụ n’onwe ya okwu nke Chineke.
Alleluịa.
OZIỌMA –Lk: 9:18-22
Ihe ọgụgụ nke a si n’Oziọma dị asọ nke Luk dere.
O ruo mgbe Jesu nọ naanị ya na-ekpe ekpere, ndị na-eso ụzọ ya bịakwutere ya. Jesu jụọ ha sị, “Onye ka ndị mmadụ na-ekwu na m bụ?” Ha zara ya sị, “Ụfọdụ na-ekwu na ị bụ Jọn onye na-eme mmirichukwu. Ụfọdụ na-asị na ị bụ Elaịja, ụfọdụ ndị ọzọ na-ekwukwa na out n’ime ndị amụma mgbe ochie esila n’ọnwụ bilie.” O wee jụọ ha sị, “Ma onye ka ụnụ na-asị na m bụ?” Pita zara sị, “Ị bụ Kristi nke Chukwu.” Ma Jesu dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka na ntị, nyesie ha iwu ike ka ha ghara ịkọrọ onye ọbụla ihe a, sị, “Nwa nke mmadụ ahụ ga-ata ọtụtụ ahụhụ. Ndị okenye ndị Juu, na ndịisi nchụaja, na ndị odeakwụkwọ ga-ajụ ya. A ga-egbukwa ya, na n’ụbọchị nke atọ a ga-eme ka o si n’ọnwụ bilie.”
Oziọma nke Oseburuwa
A. Ekene dịrị Chukwu